10/05/2026
Ndị m hụrụ n’anya n’ọgbakọ nke Onye-nwe anyị Jizọs Kraịst na-enweghi ntụpọ, ka onye ọbụla jiri nsọpụrụ, okwukwe, na obi dị ọcha bịakwute Nnukwu Onye-isi Nchụàjà anyị n’abalị taa, bụ Onye-nwe anyị Jizọs Kraịst. Mgbe anyị na-emetụ Ya aka n’ekpere na n’ime mmụọ, ka anyị cheta na ọ bụghị mmadụ nkịtị ka anyị na-abịakwute, k**a Ọ bụ Onye Nzọpụta anyị nke na-ebu ibu anyị, na-agwọ ọrịa anyị, na-agbaghara mmehie anyị, ma na-arịọchitere anyị arịrịọ n’ihu Chineke Nna.
Ihe mere anyị ji na-emetụ Nnukwu Onye-isi Nchụàjà anyị aka n’abalị taa bụ n’ihi na anyị kwere na ebere na ike Ya dị ukwuu. Dịka nwanyị ahụ nwere ọbara ọgbụgba siri metụ ọnụ uwe Onye-nwe Jizọs Kraịst aka wee nweta ọgwụgwọ, otu ahụkwa ka anyị ji okwukwe bịakwute Ya, na-atụkwasị obi na ọnụnọ Ya nwere ike ime ka ndụ anyị dị ọhụrụ, wusie mkpụrụobi anyị ike, ma nye anyị mmeri n’ime nsogbu niile.
Ka mmetụ ọbụla nke a ga-emetụ Ya n’abalị taa juputa n’ekpere:
“Onye-nwe Jizọs Kraịst, sachapụ m, wusie m ike, duzie m, ma debe m n’ịdị nsọ. Wepụ ibu ọbụla dị m n’obi ma mee ka udo Gị biri n’ime m.”
Mgbe anyị zukọtara n’ịhụnanya mgbe emechara oriri Agape, ka ịkpọasị, mpako, ekworo, na enweghị mgbaghara ghara ịdị n’etiti anyị. Ka onye ọbụla jiri ịdị umeala n’obi, ịdị nsọ, na ekele metụ Nnukwu Onye-isi Nchụàjà anyị aka, ebe anyị maara na Ọ bụ naanị Ya bụ Isi nke ọgbakọ na-enweghi ntụpọ, na Onye-ọzụzụ mkpụrụobi anyị.
Ka mmekọrịta nsọ nke abalị taa wetara anyị mmụgharị nke mmụọ, ọgwụgwọ, udo, na ịhụnanya miri emi n’etiti ụmụnna. Amen.