27/03/2026
EKELE NA ARỊRỊỌ
Ekele
Mgbe anyị wepụtara INYEAKA n’afọ 1971, o gosipụtara ihe ụmụnna n’ime Kraịst ji kọwaa ihe Baịbụl Nsọ kwuru. Ha dabeere n’ọdụdụ nke Mmụọ Nsọ dủrù ha. Ọzọ, ka anyị ghọta na ihe ọgụgụ nke INYEAKA na nke DAILY GUIDE bụ otu; mà, INYEAKA abụghị ntụgharị DAILY GUIDE, k**a ọ bụ ihe sitere n’obi ụmụnna na-asụ Igbo, e wezuga IHE ỌMỤMỤ nke na-esite n’aka ụmụnna n’ime Kraịst ndị ọzọ (nke na-adịghị n’afọ 2026 nke a).
Ùsòrò anyị na-agbaso n’idepụta Inyeaka ugbua adịlarị kemgbà afọ 2003, ma anyị agaghị echefu ikele Chineke maka ndị rụrụ ọrụ a site n’afọ 1971 ruo ugbua. Anyị wee na-ekele ndị a sonyere n’idepụta mà ọ bụ rụọ ọrụ ndị ọzọ dị mkpà maka Inyeaka 2026—
Lizzy Adị; Nnenna Aham; Thessy Amah;
(Rev.) Eugene Anyịam; Rosemary Ebenje; Chinasa Eboro;
Martha Elendụ; (Prof.) Samuel Enibe; Amuche Ezè; Japhet Ezeọcha; Jonah Ichie; Ujanma Igwe; Miriam Ikechukwu; Alice Ikwelle; Chukwunyere Kanụ; (Dr.) Chinelo Njękụ; Oluchi Nmerị;
Ụtọchị Nnabụihe; Chikọdị Nnọrọm; Emeka Nwachukwu*; Ozịoma Nwannesị;
Daniel Nwosu; Nkechi Oke; Love Okeke; Chikara Okezie;
Felix Okoro; Chiemeriwo Okoronkwo; Ebenezer Okoronkwọ;
Chinanụ Ọnụọha; (Dr.) Bọn Ọnwụpenata;
Chinyere Ụbọchị; (Prof.) S.N. Ukachukwu; Christy Ụma;
Ọlụchị Ụzọma;
(Ezinna Dr.) 𝐃𝐚𝐧 𝐍𝐧𝐞𝐣𝐢 𝐎̣𝐧𝐰𝐮̣𝐤𝐰𝐞 (Consulting Editor)
Anyị na-ekelekwa nke ukwuu Ebenezer Okoronkwọ, onye tinyere aka n’ibipụta ihe nkọwa ụfọdụ nke Inyeaka na kọmputà, tinyekwara ileba anya na kọmputà ahụ na-arụ ọrụ nke ọma.
Arịrịọ
Anyị na-ewerekwa òhèrè nke iwepụta INYEAKA 2026 na-arịọ ụmụnna na Kraịst ka ha jụọ Chineke àsè mà Ọ na-akpọ ha òkù itinye aka n’ọrụ nke a siri ike, nke chọrọ ọbụna karịa iri mmadụ anọ ime ka ọrụ a na-aga n’ihu. Tulee ịmàaka n’ihu nke dị na 2 Timoti 2:2 maka izulite ndị ọrụ nke Kraịst.
Ọ bụrụ na o metụrụ gị n’obi inye aka n’idepụta INYEAKA, biko zie ozi ka o rute m. Chineke gọzie gị.
Bro. Felix Okoro (Editor)